Habakuk 2:13
Habakkuk 2:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụ na ọ bụghị uche Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, na ndọgbu nʼọrụ niile nke mmadụ bụ na nkịtị, ihe e ji afụnwu ọkụ, na oke ọrụ niile nke mba dị iche iche bụ ihe lara nʼiyi?
Habakkuk 2:13 in English
Habakkuk 2:13 · Berean Standard Bible
Is it not indeed from the LORD of Hosts that the labor of the people only feeds the fire, and the nations weary themselves in vain?
Context
11Ọ bụladị nkume ahụ e ji wuo mgbidi ga-eti mkpu megide gị.
Osisi e ji doo elu ụlọ ga-etikwa mkpu akwa za nkume ndị ahụ. 12“Ahụhụ dịrị onye ahụ na-eji ọbara ewu obodo,
nke na-ejikwa ajọ omume eme ka obodo ahụ guzosie ike. 13Ọ bụ na ọ bụghị uche Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
na ndọgbu nʼọrụ niile nke mmadụ bụ na nkịtị, ihe e ji afụnwu ọkụ,
na oke ọrụ niile nke mba dị iche iche bụ ihe lara nʼiyi? 14Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke ebube Onyenwe anyị,
dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri. 15“Ahụhụ dịrị onye ahụ na-enye onye agbataobi ya mmanya,
nke na-anọgide na-agbanyere ya mmanya tutu ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya,
ka o si otu a hụ ọtọ ya anya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.