Habakuk 2:14
Habakkuk 2:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke ebube Onyenwe anyị, dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri.
Habakkuk 2:14 in English
Habakkuk 2:14 · Berean Standard Bible
For the earth will be filled with the knowledge of the glory of the LORD as the waters cover the sea.
Context
12“Ahụhụ dịrị onye ahụ na-eji ọbara ewu obodo,
nke na-ejikwa ajọ omume eme ka obodo ahụ guzosie ike. 13Ọ bụ na ọ bụghị uche Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile,
na ndọgbu nʼọrụ niile nke mmadụ bụ na nkịtị, ihe e ji afụnwu ọkụ,
na oke ọrụ niile nke mba dị iche iche bụ ihe lara nʼiyi? 14Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke ebube Onyenwe anyị,
dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri. 15“Ahụhụ dịrị onye ahụ na-enye onye agbataobi ya mmanya,
nke na-anọgide na-agbanyere ya mmanya tutu ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya,
ka o si otu a hụ ọtọ ya anya. 16Ihere ga-anọchi otuto na nsọpụrụ i nwere.
Ṅụọ ka ị bụrụ onye mmanya na-egbu.
Nʼihi na iko dị nʼaka nri Onyenwe anyị na-abịakwute gị.
Ihere ga-anọchikwa anya otuto gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.