Habakuk 2:16
Habakkuk 2:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ihere ga-anọchi otuto na nsọpụrụ i nwere. Ṅụọ ka ị bụrụ onye mmanya na-egbu. Nʼihi na iko dị nʼaka nri Onyenwe anyị na-abịakwute gị. Ihere ga-anọchikwa anya otuto gị.
Habakkuk 2:16 in English
Habakkuk 2:16 · Berean Standard Bible
You will be filled with shame instead of glory. You too must drink and expose your uncircumcision!* The cup in the LORD’s right hand will come around to you, and utter disgrace will cover your glory.
Context
14Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke ebube Onyenwe anyị,
dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri. 15“Ahụhụ dịrị onye ahụ na-enye onye agbataobi ya mmanya,
nke na-anọgide na-agbanyere ya mmanya tutu ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya,
ka o si otu a hụ ọtọ ya anya. 16Ihere ga-anọchi otuto na nsọpụrụ i nwere.
Ṅụọ ka ị bụrụ onye mmanya na-egbu.
Nʼihi na iko dị nʼaka nri Onyenwe anyị na-abịakwute gị.
Ihere ga-anọchikwa anya otuto gị. 17Ihe ike ahụ i mere Lebanọn ga-abịakwasịkwa gị.
Mbibi i bibiri anụmanụ dị iche iche ga-emekwa ka egwu ju gị obi.
Nʼihi na ị wụsịala ọbara ọtụtụ mmadụ,
bibie ala na obodo dị iche iche, bibiekwa ndị niile bi nʼime ha. 18“Gịnị bụ uru arụsị bara ebe ọ bụ aka mmadụ kpụrụ ya?
Kedụ uru igwe a kpụrụ akpụ bara, bụ nke na-ekwu okwu ụgha?
Nʼihi na onye na-atụkwasị ha obi na-atụkwasị obi ya nʼihe ahụ aka ya rụpụtara,
nʼihi na ọ bụ arụsị na-enweghị ike ikwu okwu ka o mere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.