Native Bible

Habakkuk 2:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ihere ga-anọchi otuto na nsọpụrụ i nwere. Ṅụọ ka ị bụrụ onye mmanya na-egbu. Nʼihi na iko dị nʼaka nri Onyenwe anyị na-abịakwute gị. Ihere ga-anọchikwa anya otuto gị.

Habakkuk 2:16 in English

Habakkuk 2:16 · Berean Standard Bible

You will be filled with shame instead of glory. You too must drink and expose your uncircumcision!* The cup in the LORD’s right hand will come around to you, and utter disgrace will cover your glory.

Context

14Nʼihi na ụwa niile ga-ejupụta na ihe ọmụma nke ebube Onyenwe anyị, dịka mmiri si ekpuchi oke osimiri. 15“Ahụhụ dịrị onye ahụ na-enye onye agbataobi ya mmanya, nke na-anọgide na-agbanyere ya mmanya tutu ruo mgbe mmanya bidoro igbu ya, ka o si otu a hụ ọtọ ya anya. 16Ihere ga-anọchi otuto na nsọpụrụ i nwere. Ṅụọ ka ị bụrụ onye mmanya na-egbu. Nʼihi na iko dị nʼaka nri Onyenwe anyị na-abịakwute gị. Ihere ga-anọchikwa anya otuto gị. 17Ihe ike ahụ i mere Lebanọn ga-abịakwasịkwa gị. Mbibi i bibiri anụmanụ dị iche iche ga-emekwa ka egwu ju gị obi. Nʼihi na ị wụsịala ọbara ọtụtụ mmadụ, bibie ala na obodo dị iche iche, bibiekwa ndị niile bi nʼime ha. 18“Gịnị bụ uru arụsị bara ebe ọ bụ aka mmadụ kpụrụ ya? Kedụ uru igwe a kpụrụ akpụ bara, bụ nke na-ekwu okwu ụgha? Nʼihi na onye na-atụkwasị ha obi na-atụkwasị obi ya nʼihe ahụ aka ya rụpụtara, nʼihi na ọ bụ arụsị na-enweghị ike ikwu okwu ka o mere.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.