Habakuk 2:18
Habakkuk 2:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Gịnị bụ uru arụsị bara ebe ọ bụ aka mmadụ kpụrụ ya? Kedụ uru igwe a kpụrụ akpụ bara, bụ nke na-ekwu okwu ụgha? Nʼihi na onye na-atụkwasị ha obi na-atụkwasị obi ya nʼihe ahụ aka ya rụpụtara, nʼihi na ọ bụ arụsị na-enweghị ike ikwu okwu ka o mere.
Habakkuk 2:18 in English
Habakkuk 2:18 · Berean Standard Bible
What use is an idol, that a craftsman should carve it— or an image, a teacher of lies? For its maker trusts in his own creation; he makes idols that cannot speak.
Context
16Ihere ga-anọchi otuto na nsọpụrụ i nwere.
Ṅụọ ka ị bụrụ onye mmanya na-egbu.
Nʼihi na iko dị nʼaka nri Onyenwe anyị na-abịakwute gị.
Ihere ga-anọchikwa anya otuto gị. 17Ihe ike ahụ i mere Lebanọn ga-abịakwasịkwa gị.
Mbibi i bibiri anụmanụ dị iche iche ga-emekwa ka egwu ju gị obi.
Nʼihi na ị wụsịala ọbara ọtụtụ mmadụ,
bibie ala na obodo dị iche iche, bibiekwa ndị niile bi nʼime ha. 18“Gịnị bụ uru arụsị bara ebe ọ bụ aka mmadụ kpụrụ ya?
Kedụ uru igwe a kpụrụ akpụ bara, bụ nke na-ekwu okwu ụgha?
Nʼihi na onye na-atụkwasị ha obi na-atụkwasị obi ya nʼihe ahụ aka ya rụpụtara,
nʼihi na ọ bụ arụsị na-enweghị ike ikwu okwu ka o mere. 19Ahụhụ dịrị onye ahụ na-agwa osisi okwu sị, ‘Dịrị ndụ.’
Ma ọ bụ nkume nke na-apụghị ikwu okwu, ‘Teta nʼụra.’
O nwere ike izi mmadụ ihe?
Lee, ọ bụ ihe eji ọlaọcha na ọlaedo machie,
ma ọ dịghị nkuume ọbụla dị nʼime ya.” 20Ma Onyenwe anyị nọ nʼime ụlọnsọ ukwu ya.
Ya mere, ka ụwa niile dere duu nʼihu ya.
2:2 Ya bụ, ọsịsa
2:4 Maọbụ, ikwesi ntụkwasị obi
2:5 Nʼakwụkwọ ụfọdụ ihe ị ga-ahụ bụ akụnụba.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.