Jenesis 49:25
Genesis 49:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
nʼihi Chineke nna gị, onye na-enyere gị aka, nʼihi Onye pụrụ ime ihe niile, ka ọ gọzie gị, site na ngọzị nke eluigwe site nʼelu, ngọzị nke osimiri dị nʼokpuru ala, ngọzị nke ara na akpanwa.
Genesis 49:25 in English
Genesis 49:25 · Berean Standard Bible
by the God of your father who helps you, and by the Almighty * who blesses you, with blessings of the heavens above, with blessings of the depths below, with blessings of the breasts and womb.
Context
23Ndị na-agbata ụta sitere nʼobi ilu lụso ya agha,
ha gbara ya àkụ site nʼịkpọ asị. 24Ma aka o ji jide ụta nke ya adaghị mba,
ike agwụghị ogwe aka ya,
nʼihi aka Onye dị ike nke Jekọb,
nʼihi Onye ọzụzụ atụrụ, Oke Nkume Izrel, 25nʼihi Chineke nna gị, onye na-enyere gị aka,
nʼihi Onye pụrụ ime ihe niile, ka ọ gọzie gị,
site na ngọzị nke eluigwe site nʼelu,
ngọzị nke osimiri dị nʼokpuru ala,
ngọzị nke ara na akpanwa. 26Ngọzị niile nke nna gị, dị ukwu karịa,
ngọzị niile nke ugwu ukwu mgbe ochie,
karịakwa ngọzị nke ugwu nta mgbe ochie,
Ka ngọzị ndị a dị iche dịkwasị nʼisi Josef,
dịkwasị nʼegedege ihu Josef, onye bụ onyendu nʼetiti ụmụnne ya. 27“Benjamin dịka nkịta ọhịa nke na-adọgbu anụ.
Nʼụtụtụ, ọ na-eri anụ ọ dọgburu.
Nʼanyasị ọ na-ekesakwa ihe o gbutere.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.