Native Bible

Genesis 49:26 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ngọzị niile nke nna gị, dị ukwu karịa, ngọzị niile nke ugwu ukwu mgbe ochie, karịakwa ngọzị nke ugwu nta mgbe ochie, Ka ngọzị ndị a dị iche dịkwasị nʼisi Josef, dịkwasị nʼegedege ihu Josef, onye bụ onyendu nʼetiti ụmụnne ya.

Genesis 49:26 in English

Genesis 49:26 · Berean Standard Bible

The blessings of your father have surpassed the blessings of the ancient mountains * and the bounty of the everlasting hills. May they rest on the head of Joseph, on the brow of the prince of his brothers.

Context

24Ma aka o ji jide ụta nke ya adaghị mba, ike agwụghị ogwe aka ya, nʼihi aka Onye dị ike nke Jekọb, nʼihi Onye ọzụzụ atụrụ, Oke Nkume Izrel, 25nʼihi Chineke nna gị, onye na-enyere gị aka, nʼihi Onye pụrụ ime ihe niile, ka ọ gọzie gị, site na ngọzị nke eluigwe site nʼelu, ngọzị nke osimiri dị nʼokpuru ala, ngọzị nke ara na akpanwa. 26Ngọzị niile nke nna gị, dị ukwu karịa, ngọzị niile nke ugwu ukwu mgbe ochie, karịakwa ngọzị nke ugwu nta mgbe ochie, Ka ngọzị ndị a dị iche dịkwasị nʼisi Josef, dịkwasị nʼegedege ihu Josef, onye bụ onyendu nʼetiti ụmụnne ya. 27“Benjamin dịka nkịta ọhịa nke na-adọgbu anụ. Nʼụtụtụ, ọ na-eri anụ ọ dọgburu. Nʼanyasị ọ na-ekesakwa ihe o gbutere.” 28Ndị a bụ ebo iri na abụọ dị nʼIzrel. Ihe ndị a bụkwa ihe nna ha gwara ha mgbe ọ gọziri ha, nye onye ọbụla nʼime ha ngọzị nke ruuru ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.