Jenesis 49:23
Genesis 49:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ndị na-agbata ụta sitere nʼobi ilu lụso ya agha, ha gbara ya àkụ site nʼịkpọ asị.
Genesis 49:23 in English
Genesis 49:23 · Berean Standard Bible
The archers attacked him with bitterness; they aimed at him in hostility.
Context
21“Naftalị dịka nne ele a hapụrụ ahapụ,
nke na-amụpụta ụmụ ele mara mma. 22“Dịka osisi vaịnị a kụrụ nʼakụkụ iyi,
nke alaka ya na-awasa rigoro nʼelu mgbidi,
na nke na-amị ezi mkpụrụ, otu a ka Josef dị. 23Ndị na-agbata ụta sitere nʼobi ilu lụso ya agha,
ha gbara ya àkụ site nʼịkpọ asị. 24Ma aka o ji jide ụta nke ya adaghị mba,
ike agwụghị ogwe aka ya,
nʼihi aka Onye dị ike nke Jekọb,
nʼihi Onye ọzụzụ atụrụ, Oke Nkume Izrel, 25nʼihi Chineke nna gị, onye na-enyere gị aka,
nʼihi Onye pụrụ ime ihe niile, ka ọ gọzie gị,
site na ngọzị nke eluigwe site nʼelu,
ngọzị nke osimiri dị nʼokpuru ala,
ngọzị nke ara na akpanwa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.