Jenesis 41:52
Genesis 41:52 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Josef gụrụ nwa ya nke abụọ Ifrem.* Ọ sịrị, “Nʼihi na Chineke emeela ka m mịa mkpụrụ nʼala nke ahụhụ m.”
Genesis 41:52 in English
Genesis 41:52 · Berean Standard Bible
And the second son he named Ephraim,* saying, “God has made me fruitful in the land of my affliction.”
Context
50Tupu oge ụnwụ ahụ ebido, Asenat nwa nwanyị Pọtifera, onye nchụaja nke On, mụtara Josef ụmụ ndị ikom abụọ. 51Josef gụrụ ọkpara ya Manase,* nʼihi na ọ sịrị, “Chineke emeela ka m chefuo ahụhụ m niile, mekwa ka m chefuo ndị ezinaụlọ nna m.” 52Josef gụrụ nwa ya nke abụọ Ifrem.* Ọ sịrị, “Nʼihi na Chineke emeela ka m mịa mkpụrụ nʼala nke ahụhụ m.” 53Afọ asaa nke ụba nri nke dịrị nʼala Ijipt mechara gabiga. 54Afọ asaa nke ụnwụ bidoro bịawa dịka Josef kwuru. Ụnwụ nọ nʼobodo niile, ma nʼala Ijipt niile nri dị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.