Native Bible

Genesis 41:50 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Tupu oge ụnwụ ahụ ebido, Asenat nwa nwanyị Pọtifera, onye nchụaja nke On, mụtara Josef ụmụ ndị ikom abụọ.

Genesis 41:50 in English

Genesis 41:50 · Berean Standard Bible

Before the years of famine arrived, two sons were born to Joseph by Asenath daughter of Potiphera, priest of On.

Context

48Nʼime afọ asaa ndị a nke nri juru ebe niile nʼIjipt, Josef chịkọtara nri niile nke si nʼubi, ma chekwaa ha nʼụlọ e wuru maka iche nri nʼobodo niile ahụ. Nʼobodo ọbụla, ka ọ na-etinye ihe oriri nke si nʼubi gbara ya gburugburu. 49Josef chekwara ọka dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka aja dị nʼakụkụ osimiri. A kwụsịrị ịgụ ha ọnụ nʼihi na ha hiri nne nke ukwuu nke na ha enweghị ọnụọgụgụ. 50Tupu oge ụnwụ ahụ ebido, Asenat nwa nwanyị Pọtifera, onye nchụaja nke On, mụtara Josef ụmụ ndị ikom abụọ. 51Josef gụrụ ọkpara ya Manase,* nʼihi na ọ sịrị, “Chineke emeela ka m chefuo ahụhụ m niile, mekwa ka m chefuo ndị ezinaụlọ nna m.” 52Josef gụrụ nwa ya nke abụọ Ifrem.* Ọ sịrị, “Nʼihi na Chineke emeela ka m mịa mkpụrụ nʼala nke ahụhụ m.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.