Jenesis 41:49
Genesis 41:49 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Josef chekwara ọka dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka aja dị nʼakụkụ osimiri. A kwụsịrị ịgụ ha ọnụ nʼihi na ha hiri nne nke ukwuu nke na ha enweghị ọnụọgụgụ.
Genesis 41:49 in English
Genesis 41:49 · Berean Standard Bible
So Joseph stored up grain in such abundance, like the sand of the sea, that he stopped keeping track of it; for it was beyond measure.
Context
47Nʼafọ asaa ahụ nke a na-eriju afọ, ala mepụtara nri nʼebe ọ dị ukwuu. 48Nʼime afọ asaa ndị a nke nri juru ebe niile nʼIjipt, Josef chịkọtara nri niile nke si nʼubi, ma chekwaa ha nʼụlọ e wuru maka iche nri nʼobodo niile ahụ. Nʼobodo ọbụla, ka ọ na-etinye ihe oriri nke si nʼubi gbara ya gburugburu. 49Josef chekwara ọka dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka aja dị nʼakụkụ osimiri. A kwụsịrị ịgụ ha ọnụ nʼihi na ha hiri nne nke ukwuu nke na ha enweghị ọnụọgụgụ. 50Tupu oge ụnwụ ahụ ebido, Asenat nwa nwanyị Pọtifera, onye nchụaja nke On, mụtara Josef ụmụ ndị ikom abụọ. 51Josef gụrụ ọkpara ya Manase,* nʼihi na ọ sịrị, “Chineke emeela ka m chefuo ahụhụ m niile, mekwa ka m chefuo ndị ezinaụlọ nna m.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.