Native Bible

Genesis 41:51 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Josef gụrụ ọkpara ya Manase,* nʼihi na ọ sịrị, “Chineke emeela ka m chefuo ahụhụ m niile, mekwa ka m chefuo ndị ezinaụlọ nna m.”

Genesis 41:51 in English

Genesis 41:51 · Berean Standard Bible

Joseph named the firstborn Manasseh,* saying, “God has made me forget all my hardship and all my father’s household.”

Context

49Josef chekwara ọka dị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka aja dị nʼakụkụ osimiri. A kwụsịrị ịgụ ha ọnụ nʼihi na ha hiri nne nke ukwuu nke na ha enweghị ọnụọgụgụ. 50Tupu oge ụnwụ ahụ ebido, Asenat nwa nwanyị Pọtifera, onye nchụaja nke On, mụtara Josef ụmụ ndị ikom abụọ. 51Josef gụrụ ọkpara ya Manase,* nʼihi na ọ sịrị, “Chineke emeela ka m chefuo ahụhụ m niile, mekwa ka m chefuo ndị ezinaụlọ nna m.” 52Josef gụrụ nwa ya nke abụọ Ifrem.* Ọ sịrị, “Nʼihi na Chineke emeela ka m mịa mkpụrụ nʼala nke ahụhụ m.” 53Afọ asaa nke ụba nri nke dịrị nʼala Ijipt mechara gabiga.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.