Native Bible

Genesis 41:54 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Afọ asaa nke ụnwụ bidoro bịawa dịka Josef kwuru. Ụnwụ nọ nʼobodo niile, ma nʼala Ijipt niile nri dị.

Genesis 41:54 in English

Genesis 41:54 · Berean Standard Bible

the seven years of famine began, just as Joseph had said. And although there was famine in every country, there was food throughout the land of Egypt.

Context

52Josef gụrụ nwa ya nke abụọ Ifrem.* Ọ sịrị, “Nʼihi na Chineke emeela ka m mịa mkpụrụ nʼala nke ahụhụ m.” 53Afọ asaa nke ụba nri nke dịrị nʼala Ijipt mechara gabiga. 54Afọ asaa nke ụnwụ bidoro bịawa dịka Josef kwuru. Ụnwụ nọ nʼobodo niile, ma nʼala Ijipt niile nri dị. 55Ka agụ jidere ala Ijipt niile, ndị mmadụ tikuru Fero ka o nye ha nri. Ma Fero gwara ndị Ijipt niile, “Jekwurunụ Josef. Ihe ọbụla ọ gwara unu meenụ ya.” 56Mgbe ụnwụ ahụ gbasara ruo nʼakụkụ niile nke ala ahụ, Josef meghepụrụ ụlọ ichebe nri niile bido iresi ndị Ijipt nri, nʼihi na ụnwụ ahụ dị njọ nʼala Ijipt niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.