Jenesis 41:45
Genesis 41:45 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Fero gụrụ Josef aha Zafenat-Pania.* Ọ kpọnyekwara ya, Asenat, nwa Pọtifera, onye nchụaja obodo a na-akpọ On,* ka ọ bụrụ nwunye ya. Josef bịara gazuo ala Ijipt.
Genesis 41:45 in English
Genesis 41:45 · Berean Standard Bible
Pharaoh gave Joseph the name Zaphenath-paneah,* and he gave him Asenath daughter of Potiphera, priest of On,* to be his wife. And Joseph took charge of all the land of Egypt.
Context
43O mere ka ọ nyaa ịnyịnya ụgbọ ya nke abụọ. Ndị oti mkpu na-etikwa nʼihu ya, “Gbuonụ ikpere nʼala.” Otu a ka Fero si mee Josef onye na-achị ala Ijipt niile. 44Fero gwakwara Josef sị, “Ọ bụ mụ onwe m bụ Fero! O nweghị onye ọbụla ga-ewelita aka maọbụ ụkwụ ya nʼala Ijipt niile ma ọ bụghị site nʼike i nyere ya.” 45Fero gụrụ Josef aha Zafenat-Pania.* Ọ kpọnyekwara ya, Asenat, nwa Pọtifera, onye nchụaja obodo a na-akpọ On,* ka ọ bụrụ nwunye ya. Josef bịara gazuo ala Ijipt. 46Josef gbara iri afọ atọ mgbe o bidoro iguzo nʼihu Fero eze Ijipt. O si nʼihu Fero pụọ, malite ijegharị ebe niile nʼala Ijipt. 47Nʼafọ asaa ahụ nke a na-eriju afọ, ala mepụtara nri nʼebe ọ dị ukwuu.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.