Jenesis 41:44
Genesis 41:44 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Fero gwakwara Josef sị, “Ọ bụ mụ onwe m bụ Fero! O nweghị onye ọbụla ga-ewelita aka maọbụ ụkwụ ya nʼala Ijipt niile ma ọ bụghị site nʼike i nyere ya.”
Genesis 41:44 in English
Genesis 41:44 · Berean Standard Bible
And Pharaoh declared to Joseph, “I am Pharaoh, but without your permission, no one in all the land of Egypt shall lift his hand or foot.”
Context
42Mgbe ahụ, Fero gbapụtara mgbaaka* eze ya gbanye ya Josef nʼaka. O yikwasịkwara Josef uwe e ji ezi akwa ọcha duo, nyanye ya ihe ịnya nʼolu nke e ji ọlaedo kpụọ. 43O mere ka ọ nyaa ịnyịnya ụgbọ ya nke abụọ. Ndị oti mkpu na-etikwa nʼihu ya, “Gbuonụ ikpere nʼala.” Otu a ka Fero si mee Josef onye na-achị ala Ijipt niile. 44Fero gwakwara Josef sị, “Ọ bụ mụ onwe m bụ Fero! O nweghị onye ọbụla ga-ewelita aka maọbụ ụkwụ ya nʼala Ijipt niile ma ọ bụghị site nʼike i nyere ya.” 45Fero gụrụ Josef aha Zafenat-Pania.* Ọ kpọnyekwara ya, Asenat, nwa Pọtifera, onye nchụaja obodo a na-akpọ On,* ka ọ bụrụ nwunye ya. Josef bịara gazuo ala Ijipt. 46Josef gbara iri afọ atọ mgbe o bidoro iguzo nʼihu Fero eze Ijipt. O si nʼihu Fero pụọ, malite ijegharị ebe niile nʼala Ijipt.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.