Jenesis 41:42
Genesis 41:42 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Fero gbapụtara mgbaaka* eze ya gbanye ya Josef nʼaka. O yikwasịkwara Josef uwe e ji ezi akwa ọcha duo, nyanye ya ihe ịnya nʼolu nke e ji ọlaedo kpụọ.
Genesis 41:42 in English
Genesis 41:42 · Berean Standard Bible
Then Pharaoh removed the signet ring from his finger, put it on Joseph’s finger, clothed him in garments of fine linen, and placed a gold chain around his neck.
Context
40Gị onwe gị ga-abụ onye na-elekọta ụlọeze m. Ndị m niile ga-erube isi nʼiwu ọbụla i nyere. Ọ bụ naanị nʼocheeze ka m ga-eji dị ukwuu karịa gị.” 41Fero gwara Josef, “Lee, emeela m gị onye nlekọta ala Ijipt niile.” 42Mgbe ahụ, Fero gbapụtara mgbaaka* eze ya gbanye ya Josef nʼaka. O yikwasịkwara Josef uwe e ji ezi akwa ọcha duo, nyanye ya ihe ịnya nʼolu nke e ji ọlaedo kpụọ. 43O mere ka ọ nyaa ịnyịnya ụgbọ ya nke abụọ. Ndị oti mkpu na-etikwa nʼihu ya, “Gbuonụ ikpere nʼala.” Otu a ka Fero si mee Josef onye na-achị ala Ijipt niile. 44Fero gwakwara Josef sị, “Ọ bụ mụ onwe m bụ Fero! O nweghị onye ọbụla ga-ewelita aka maọbụ ụkwụ ya nʼala Ijipt niile ma ọ bụghị site nʼike i nyere ya.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.