Native Bible

Genesis 41:40 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Gị onwe gị ga-abụ onye na-elekọta ụlọeze m. Ndị m niile ga-erube isi nʼiwu ọbụla i nyere. Ọ bụ naanị nʼocheeze ka m ga-eji dị ukwuu karịa gị.”

Genesis 41:40 in English

Genesis 41:40 · Berean Standard Bible

You shall be in charge of my house, and all my people are to obey your commands. Only with regard to the throne will I be greater than you.”

Context

38Fero jụrụ ndịisi ọchịchị ya, “Anyị ga-achọtali onye ọzọ dịka nwoke a, onye mmụọ nke Chineke dị nʼime ya?” 39Ya mere Fero tụgharịrị sị Josef, “Ebe Chineke kpugheere gị ihe ndị a, o nweghị onye ọzọ nwere ezi nghọta na amamihe dịka gị. 40Gị onwe gị ga-abụ onye na-elekọta ụlọeze m. Ndị m niile ga-erube isi nʼiwu ọbụla i nyere. Ọ bụ naanị nʼocheeze ka m ga-eji dị ukwuu karịa gị.” 41Fero gwara Josef, “Lee, emeela m gị onye nlekọta ala Ijipt niile.” 42Mgbe ahụ, Fero gbapụtara mgbaaka* eze ya gbanye ya Josef nʼaka. O yikwasịkwara Josef uwe e ji ezi akwa ọcha duo, nyanye ya ihe ịnya nʼolu nke e ji ọlaedo kpụọ.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.