Native Bible

Genesis 41:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere Fero tụgharịrị sị Josef, “Ebe Chineke kpugheere gị ihe ndị a, o nweghị onye ọzọ nwere ezi nghọta na amamihe dịka gị.

Genesis 41:39 in English

Genesis 41:39 · Berean Standard Bible

Then Pharaoh said to Joseph, “Since God has made all this known to you, there is no one as discerning and wise as you.

Context

37Ntụpụta ahụ dị mma nʼanya Fero na ndịisi ọchịchị ya. 38Fero jụrụ ndịisi ọchịchị ya, “Anyị ga-achọtali onye ọzọ dịka nwoke a, onye mmụọ nke Chineke dị nʼime ya?” 39Ya mere Fero tụgharịrị sị Josef, “Ebe Chineke kpugheere gị ihe ndị a, o nweghị onye ọzọ nwere ezi nghọta na amamihe dịka gị. 40Gị onwe gị ga-abụ onye na-elekọta ụlọeze m. Ndị m niile ga-erube isi nʼiwu ọbụla i nyere. Ọ bụ naanị nʼocheeze ka m ga-eji dị ukwuu karịa gị.” 41Fero gwara Josef, “Lee, emeela m gị onye nlekọta ala Ijipt niile.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.