Native Bible

Genesis 41:37 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ntụpụta ahụ dị mma nʼanya Fero na ndịisi ọchịchị ya.

Genesis 41:37 in English

Genesis 41:37 · Berean Standard Bible

This proposal pleased Pharaoh and all his officials.

Context

35Ka ha kpokọtaa nri niile ga-adị nʼoge ịba ụba nke ihe oriri, nke ga-adị nʼafọ ndị a na-abịa. Ka ha kpokọta ha nʼụlọ ichebe nri nke ga-adị nʼokpuru ọchịchị Fero. Ka ọ bụrụ nri e debere nʼobodo dị iche iche. 36A ga-echebe nri ndị a nke ọma maka ndị bi nʼala a, ka ọ bụrụ nri a ga-eri nʼime afọ asaa ndị ahụ nke ụnwụ ga-adị nʼala Ijipt, ka ụnwụ ghara ibibi ala a.” 37Ntụpụta ahụ dị mma nʼanya Fero na ndịisi ọchịchị ya. 38Fero jụrụ ndịisi ọchịchị ya, “Anyị ga-achọtali onye ọzọ dịka nwoke a, onye mmụọ nke Chineke dị nʼime ya?” 39Ya mere Fero tụgharịrị sị Josef, “Ebe Chineke kpugheere gị ihe ndị a, o nweghị onye ọzọ nwere ezi nghọta na amamihe dịka gị.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.