Jenesis 41:35
Genesis 41:35 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ka ha kpokọtaa nri niile ga-adị nʼoge ịba ụba nke ihe oriri, nke ga-adị nʼafọ ndị a na-abịa. Ka ha kpokọta ha nʼụlọ ichebe nri nke ga-adị nʼokpuru ọchịchị Fero. Ka ọ bụrụ nri e debere nʼobodo dị iche iche.
Genesis 41:35 in English
Genesis 41:35 · Berean Standard Bible
Under the authority of Pharaoh, let them collect all the excess food from these good years, that they may come and lay up the grain to be preserved as food in the cities.
Context
33“Ma ugbu a, ka Fero chọọ onye nwere ezi nghọta na amamihe. Ya mee ya onyeisi ọchịchị nʼala Ijipt niile. 34Ka Fero mee nhọpụta ndị nlekọta ala Ijipt. Ka e debe otu ụzọ nʼime ụzọ ise nke nri niile a ga-enweta nʼoge ahụ nri ga-adị ukwuu nʼala Ijipt. 35Ka ha kpokọtaa nri niile ga-adị nʼoge ịba ụba nke ihe oriri, nke ga-adị nʼafọ ndị a na-abịa. Ka ha kpokọta ha nʼụlọ ichebe nri nke ga-adị nʼokpuru ọchịchị Fero. Ka ọ bụrụ nri e debere nʼobodo dị iche iche. 36A ga-echebe nri ndị a nke ọma maka ndị bi nʼala a, ka ọ bụrụ nri a ga-eri nʼime afọ asaa ndị ahụ nke ụnwụ ga-adị nʼala Ijipt, ka ụnwụ ghara ibibi ala a.” 37Ntụpụta ahụ dị mma nʼanya Fero na ndịisi ọchịchị ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.