Native Bible

Genesis 41:43 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O mere ka ọ nyaa ịnyịnya ụgbọ ya nke abụọ. Ndị oti mkpu na-etikwa nʼihu ya, “Gbuonụ ikpere nʼala.” Otu a ka Fero si mee Josef onye na-achị ala Ijipt niile.

Genesis 41:43 in English

Genesis 41:43 · Berean Standard Bible

He had Joseph ride in his second chariot, with men calling out before him, “Bow the knee!”* So he placed him over all the land of Egypt.

Context

41Fero gwara Josef, “Lee, emeela m gị onye nlekọta ala Ijipt niile.” 42Mgbe ahụ, Fero gbapụtara mgbaaka* eze ya gbanye ya Josef nʼaka. O yikwasịkwara Josef uwe e ji ezi akwa ọcha duo, nyanye ya ihe ịnya nʼolu nke e ji ọlaedo kpụọ. 43O mere ka ọ nyaa ịnyịnya ụgbọ ya nke abụọ. Ndị oti mkpu na-etikwa nʼihu ya, “Gbuonụ ikpere nʼala.” Otu a ka Fero si mee Josef onye na-achị ala Ijipt niile. 44Fero gwakwara Josef sị, “Ọ bụ mụ onwe m bụ Fero! O nweghị onye ọbụla ga-ewelita aka maọbụ ụkwụ ya nʼala Ijipt niile ma ọ bụghị site nʼike i nyere ya.” 45Fero gụrụ Josef aha Zafenat-Pania.* Ọ kpọnyekwara ya, Asenat, nwa Pọtifera, onye nchụaja obodo a na-akpọ On,* ka ọ bụrụ nwunye ya. Josef bịara gazuo ala Ijipt.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.