Jenesis 40:3
Genesis 40:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O tinyere ha na nga, nʼụlọ mkpọrọ dị nʼụlọ onyeisi ndị nche, ebe ahụ a tụbara Josef.
Genesis 40:3 in English
Genesis 40:3 · Berean Standard Bible
and imprisoned them in the house of the captain of the guard, the same prison where Joseph was confined.
Context
1Mgbe ụfọdụ oge gasịrị, onye na-ebu iko ihe ọṅụṅụ eze Ijipt na onye na-esiri ya nri mehiere megide nna ha ukwu, eze Ijipt. 2Nʼihi ya, Fero were iwe megide ndị ozi ya abụọ ndị a, onyeisi ndị na-ebu iko ya na onye na-esiri ya nri. 3O tinyere ha na nga, nʼụlọ mkpọrọ dị nʼụlọ onyeisi ndị nche, ebe ahụ a tụbara Josef. 4Onyeisi ndị nche mere Josef onye na-elekọta ha.
Ha nọrọ nʼụlọ mkpọrọ ọtụtụ ụbọchị. 5Ha abụọ, onye ahụ na-esiri eze nri, na onye na-ebu iko eze Ijipt, rọrọ nrọ nʼotu abalị. Nrọ nke onye ọ bụla nwere nkọwa nke ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.