Jenesis 40:2
Genesis 40:2 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼihi ya, Fero were iwe megide ndị ozi ya abụọ ndị a, onyeisi ndị na-ebu iko ya na onye na-esiri ya nri.
Genesis 40:2 in English
Genesis 40:2 · Berean Standard Bible
Pharaoh was angry with his two officers, the chief cupbearer and the chief baker,
Context
1Mgbe ụfọdụ oge gasịrị, onye na-ebu iko ihe ọṅụṅụ eze Ijipt na onye na-esiri ya nri mehiere megide nna ha ukwu, eze Ijipt. 2Nʼihi ya, Fero were iwe megide ndị ozi ya abụọ ndị a, onyeisi ndị na-ebu iko ya na onye na-esiri ya nri. 3O tinyere ha na nga, nʼụlọ mkpọrọ dị nʼụlọ onyeisi ndị nche, ebe ahụ a tụbara Josef. 4Onyeisi ndị nche mere Josef onye na-elekọta ha.
Ha nọrọ nʼụlọ mkpọrọ ọtụtụ ụbọchị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.