Native Bible

Genesis 40:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ụfọdụ oge gasịrị, onye na-ebu iko ihe ọṅụṅụ eze Ijipt na onye na-esiri ya nri mehiere megide nna ha ukwu, eze Ijipt.

Genesis 40:1 in English

Genesis 40:1 · Berean Standard Bible

Some time later, the king’s cupbearer and baker offended their master, the king of Egypt.

Context

1Mgbe ụfọdụ oge gasịrị, onye na-ebu iko ihe ọṅụṅụ eze Ijipt na onye na-esiri ya nri mehiere megide nna ha ukwu, eze Ijipt. 2Nʼihi ya, Fero were iwe megide ndị ozi ya abụọ ndị a, onyeisi ndị na-ebu iko ya na onye na-esiri ya nri. 3O tinyere ha na nga, nʼụlọ mkpọrọ dị nʼụlọ onyeisi ndị nche, ebe ahụ a tụbara Josef.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.