Jenesis 4:24
Genesis 4:24 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ bụrụ na a ga-abọtara Ken ọbọ ugboro asaa, mgbe ahụ, a ga-abọtara Lamek ọbọ iri ugboro asaa na asaa.”
Genesis 4:24 in English
Genesis 4:24 · Berean Standard Bible
If Cain is avenged sevenfold, then Lamech seventy-sevenfold.”*
Context
22Zila, mụtara otu nwa nwoke aha ya bụ Tubal Ken, onye bụ nna ndị niile na-akpụ ihe dị iche iche e ji bronz maọbụ igwe kpụọ. Aha nwanne nwanyị Tubal Ken bụ Naama. 23Lamek kpọrọ ndị nwunye ya sị ha,
“Geenụ m ntị, Ada na Zila,
unu ndị nwunye Lamek, nụrụ okwu sị m nʼọnụ.
Egbuola m otu nwoke nʼihi na ọ merụrụ m ahụ,
otu nwokorobịa nʼihi na ọ mehịara m ahụ. 24Ọ bụrụ na a ga-abọtara Ken ọbọ ugboro asaa,
mgbe ahụ, a ga-abọtara Lamek ọbọ iri ugboro asaa na asaa.” 25Adam na Iiv dinakọrọ ọzọ, Iiv tụụrụ ime mụta nwa nwoke ọ gụrụ Set. Nʼihi na Iiv kwuru sị, “Chineke enyela m nwa nwoke ọzọ nʼọnọdụ Ebel onye Ken gburu.” 26Set mụtara nwa nwoke gụọ ya Enọsh.
Nʼoge ahụ ka ụmụ mmadụ bidoro ịkpọku aha Onyenwe anyị.
4:16 Nọd pụtara Awagharị Nke a dị nʼamaokwu 4:12,16
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.