Jenesis 4:25
Genesis 4:25 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Adam na Iiv dinakọrọ ọzọ, Iiv tụụrụ ime mụta nwa nwoke ọ gụrụ Set. Nʼihi na Iiv kwuru sị, “Chineke enyela m nwa nwoke ọzọ nʼọnọdụ Ebel onye Ken gburu.”
Genesis 4:25 in English
Genesis 4:25 · Berean Standard Bible
And Adam again had relations with his wife, and she gave birth to a son and named him Seth,* saying, “God has granted me another seed in place of Abel, since Cain killed him.”
Context
23Lamek kpọrọ ndị nwunye ya sị ha,
“Geenụ m ntị, Ada na Zila,
unu ndị nwunye Lamek, nụrụ okwu sị m nʼọnụ.
Egbuola m otu nwoke nʼihi na ọ merụrụ m ahụ,
otu nwokorobịa nʼihi na ọ mehịara m ahụ. 24Ọ bụrụ na a ga-abọtara Ken ọbọ ugboro asaa,
mgbe ahụ, a ga-abọtara Lamek ọbọ iri ugboro asaa na asaa.” 25Adam na Iiv dinakọrọ ọzọ, Iiv tụụrụ ime mụta nwa nwoke ọ gụrụ Set. Nʼihi na Iiv kwuru sị, “Chineke enyela m nwa nwoke ọzọ nʼọnọdụ Ebel onye Ken gburu.” 26Set mụtara nwa nwoke gụọ ya Enọsh.
Nʼoge ahụ ka ụmụ mmadụ bidoro ịkpọku aha Onyenwe anyị.
4:16 Nọd pụtara Awagharị Nke a dị nʼamaokwu 4:12,16
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.