Jenesis 4:23
Genesis 4:23 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Lamek kpọrọ ndị nwunye ya sị ha, “Geenụ m ntị, Ada na Zila, unu ndị nwunye Lamek, nụrụ okwu sị m nʼọnụ. Egbuola m otu nwoke nʼihi na ọ merụrụ m ahụ, otu nwokorobịa nʼihi na ọ mehịara m ahụ.
Genesis 4:23 in English
Genesis 4:23 · Berean Standard Bible
Then Lamech said to his wives: “Adah and Zillah, hear my voice; wives of Lamech, listen to my speech. For I have slain a man for wounding me, a young man for striking me.
Context
21Aha nwanne ya nwoke bụ Jubal, onye mbụ bụ nna ndị na-akpọ ụbọ akwara, na ndị na-afụ opi. 22Zila, mụtara otu nwa nwoke aha ya bụ Tubal Ken, onye bụ nna ndị niile na-akpụ ihe dị iche iche e ji bronz maọbụ igwe kpụọ. Aha nwanne nwanyị Tubal Ken bụ Naama. 23Lamek kpọrọ ndị nwunye ya sị ha,
“Geenụ m ntị, Ada na Zila,
unu ndị nwunye Lamek, nụrụ okwu sị m nʼọnụ.
Egbuola m otu nwoke nʼihi na ọ merụrụ m ahụ,
otu nwokorobịa nʼihi na ọ mehịara m ahụ. 24Ọ bụrụ na a ga-abọtara Ken ọbọ ugboro asaa,
mgbe ahụ, a ga-abọtara Lamek ọbọ iri ugboro asaa na asaa.” 25Adam na Iiv dinakọrọ ọzọ, Iiv tụụrụ ime mụta nwa nwoke ọ gụrụ Set. Nʼihi na Iiv kwuru sị, “Chineke enyela m nwa nwoke ọzọ nʼọnọdụ Ebel onye Ken gburu.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.