Jenesis 3:18
Genesis 3:18 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ ga-erupụtara gị ogwu na uke, ị ga-erikwa ahịhịa nke ubi.
Genesis 3:18 in English
Genesis 3:18 · Berean Standard Bible
Both thorns and thistles it will yield for you, and you will eat the plants of the field.
Context
16Ọ gwara nwanyị ahụ sị ya,
“Aga m eme ka ihe mgbu nke ịmụ nwa gị baa ụba nke ukwuu,
ọ bụ site nʼihe mgbu ka ị ga-eji mụpụta ụmụ gị.
Ọchịchọ nke obi gị ga-adị nʼaka di gị,
ọ bụ ya ga-achịkwa gị.” 17Ọ gwara Adam sị, “Nʼihi na ị ṅara nwunye gị ntị, rie mkpụrụ site nʼosisi ahụ m nyere gị iwu sị, ‘Gị erila mkpụrụ sitere na ya,’
“Ala bụ ihe a bụrụ ọnụ nʼihi gị,
site nʼoke ndọgbu nʼọrụ ka ị ga-eri ihe si na ya pụta
ogologo ụbọchị ndụ gị niile. 18Ọ ga-erupụtara gị ogwu na uke,
ị ga-erikwa ahịhịa nke ubi. 19Site nʼọsụsọ nke ga-agbapụta gị nʼihu
ka ị ga-eri nri gị
tutu ruo mgbe ị lọghachiri nʼala
ebe ọ bụ site nʼala ka e si mepụta gị
nʼihi na aja ka ị bụ,
nʼaja ka ị ga-alaghachikwa.” 20Adam* gụrụ nwunye ya Iiv,* nʼihi na ọ bụ nne mmadụ niile dị ndụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.