Jenesis 3:16
Genesis 3:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ gwara nwanyị ahụ sị ya, “Aga m eme ka ihe mgbu nke ịmụ nwa gị baa ụba nke ukwuu, ọ bụ site nʼihe mgbu ka ị ga-eji mụpụta ụmụ gị. Ọchịchọ nke obi gị ga-adị nʼaka di gị, ọ bụ ya ga-achịkwa gị.”
Genesis 3:16 in English
Genesis 3:16 · Berean Standard Bible
To the woman He said: “I will sharply increase your pain in childbirth; in pain you will bring forth children. Your desire will be for your husband,* and he will rule over you.”
Context
14Ya mere, Onyenwe anyị Chineke gwara agwọ ahụ sị, “Nʼihi ihe a i mere,
“Ihe a bụrụ ọnụ ka ị bụ nʼetiti anụ ụlọ niile
na nʼetiti anụ ọhịa niile.
Afọ gị ka ị ga-eji na-aga ije,
aja ka ị ga na-eri
ogologo ụbọchị ndụ gị niile. 15Aga m eme ka iro
dịrị nʼetiti gị na nwanyị ahụ,
nʼetiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya,
mkpụrụ ya ga-etipịa gị isi,
gị onwe gị ga-ata ya arụ nʼikiri ụkwụ.” 16Ọ gwara nwanyị ahụ sị ya,
“Aga m eme ka ihe mgbu nke ịmụ nwa gị baa ụba nke ukwuu,
ọ bụ site nʼihe mgbu ka ị ga-eji mụpụta ụmụ gị.
Ọchịchọ nke obi gị ga-adị nʼaka di gị,
ọ bụ ya ga-achịkwa gị.” 17Ọ gwara Adam sị, “Nʼihi na ị ṅara nwunye gị ntị, rie mkpụrụ site nʼosisi ahụ m nyere gị iwu sị, ‘Gị erila mkpụrụ sitere na ya,’
“Ala bụ ihe a bụrụ ọnụ nʼihi gị,
site nʼoke ndọgbu nʼọrụ ka ị ga-eri ihe si na ya pụta
ogologo ụbọchị ndụ gị niile. 18Ọ ga-erupụtara gị ogwu na uke,
ị ga-erikwa ahịhịa nke ubi.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.