Jenesis 3:14
Genesis 3:14 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, Onyenwe anyị Chineke gwara agwọ ahụ sị, “Nʼihi ihe a i mere, “Ihe a bụrụ ọnụ ka ị bụ nʼetiti anụ ụlọ niile na nʼetiti anụ ọhịa niile. Afọ gị ka ị ga-eji na-aga ije, aja ka ị ga na-eri ogologo ụbọchị ndụ gị niile.
Genesis 3:14 in English
Genesis 3:14 · Berean Standard Bible
So the LORD God said to the serpent: “Because you have done this, cursed are you above all livestock and every beast of the field! On your belly will you go, and dust you will eat, all the days of your life.
Context
12Nwoke ahụ sịrị, “Nwanyị ahụ i mere ka mụ na ya nọdụ, ọ bụ ya nyere m mkpụrụ sitere nʼosisi ahụ, m rie.” 13Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke sịrị nwanyị ahụ, “Gịnị bụ ihe a i mere?”
Nwanyị ahụ zara sị, “Ọ bụ agwọ ghọgburu m, mee m ka m rie ya.” 14Ya mere, Onyenwe anyị Chineke gwara agwọ ahụ sị, “Nʼihi ihe a i mere,
“Ihe a bụrụ ọnụ ka ị bụ nʼetiti anụ ụlọ niile
na nʼetiti anụ ọhịa niile.
Afọ gị ka ị ga-eji na-aga ije,
aja ka ị ga na-eri
ogologo ụbọchị ndụ gị niile. 15Aga m eme ka iro
dịrị nʼetiti gị na nwanyị ahụ,
nʼetiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya,
mkpụrụ ya ga-etipịa gị isi,
gị onwe gị ga-ata ya arụ nʼikiri ụkwụ.” 16Ọ gwara nwanyị ahụ sị ya,
“Aga m eme ka ihe mgbu nke ịmụ nwa gị baa ụba nke ukwuu,
ọ bụ site nʼihe mgbu ka ị ga-eji mụpụta ụmụ gị.
Ọchịchọ nke obi gị ga-adị nʼaka di gị,
ọ bụ ya ga-achịkwa gị.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.