Jenesis 3:13
Genesis 3:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke sịrị nwanyị ahụ, “Gịnị bụ ihe a i mere?” Nwanyị ahụ zara sị, “Ọ bụ agwọ ghọgburu m, mee m ka m rie ya.”
Genesis 3:13 in English
Genesis 3:13 · Berean Standard Bible
Then the LORD God said to the woman, “What is this you have done?” “The serpent deceived me,” she replied, “and I ate.”
Context
11Onyenwe anyị Chineke jụrụ ya sị, “Onye gwara gị na ị gba ọtọ? I riela mkpụrụ si nʼosisi ahụ m nyere gị iwu sị gị erila?” 12Nwoke ahụ sịrị, “Nwanyị ahụ i mere ka mụ na ya nọdụ, ọ bụ ya nyere m mkpụrụ sitere nʼosisi ahụ, m rie.” 13Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke sịrị nwanyị ahụ, “Gịnị bụ ihe a i mere?”
Nwanyị ahụ zara sị, “Ọ bụ agwọ ghọgburu m, mee m ka m rie ya.” 14Ya mere, Onyenwe anyị Chineke gwara agwọ ahụ sị, “Nʼihi ihe a i mere,
“Ihe a bụrụ ọnụ ka ị bụ nʼetiti anụ ụlọ niile
na nʼetiti anụ ọhịa niile.
Afọ gị ka ị ga-eji na-aga ije,
aja ka ị ga na-eri
ogologo ụbọchị ndụ gị niile. 15Aga m eme ka iro
dịrị nʼetiti gị na nwanyị ahụ,
nʼetiti mkpụrụ gị na mkpụrụ ya,
mkpụrụ ya ga-etipịa gị isi,
gị onwe gị ga-ata ya arụ nʼikiri ụkwụ.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.