Jenesis 3:12
Genesis 3:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nwoke ahụ sịrị, “Nwanyị ahụ i mere ka mụ na ya nọdụ, ọ bụ ya nyere m mkpụrụ sitere nʼosisi ahụ, m rie.”
Genesis 3:12 in English
Genesis 3:12 · Berean Standard Bible
And the man answered, “The woman whom You gave me, she gave me fruit from the tree, and I ate it.”
Context
10Ọ zara si, “Anụrụ m ụda ụkwụ gị nʼogige, nʼihi ya, atụrụ m ụjọ, ebe ọ bụ na m gba ọtọ. Ezokwara m onwe m.” 11Onyenwe anyị Chineke jụrụ ya sị, “Onye gwara gị na ị gba ọtọ? I riela mkpụrụ si nʼosisi ahụ m nyere gị iwu sị gị erila?” 12Nwoke ahụ sịrị, “Nwanyị ahụ i mere ka mụ na ya nọdụ, ọ bụ ya nyere m mkpụrụ sitere nʼosisi ahụ, m rie.” 13Mgbe ahụ, Onyenwe anyị Chineke sịrị nwanyị ahụ, “Gịnị bụ ihe a i mere?”
Nwanyị ahụ zara sị, “Ọ bụ agwọ ghọgburu m, mee m ka m rie ya.” 14Ya mere, Onyenwe anyị Chineke gwara agwọ ahụ sị, “Nʼihi ihe a i mere,
“Ihe a bụrụ ọnụ ka ị bụ nʼetiti anụ ụlọ niile
na nʼetiti anụ ọhịa niile.
Afọ gị ka ị ga-eji na-aga ije,
aja ka ị ga na-eri
ogologo ụbọchị ndụ gị niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.