Jenesis 3:20
Genesis 3:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Adam* gụrụ nwunye ya Iiv,* nʼihi na ọ bụ nne mmadụ niile dị ndụ.
Genesis 3:20 in English
Genesis 3:20 · Berean Standard Bible
And Adam named his wife Eve,* because she would be the mother of all the living.
Context
18Ọ ga-erupụtara gị ogwu na uke,
ị ga-erikwa ahịhịa nke ubi. 19Site nʼọsụsọ nke ga-agbapụta gị nʼihu
ka ị ga-eri nri gị
tutu ruo mgbe ị lọghachiri nʼala
ebe ọ bụ site nʼala ka e si mepụta gị
nʼihi na aja ka ị bụ,
nʼaja ka ị ga-alaghachikwa.” 20Adam* gụrụ nwunye ya Iiv,* nʼihi na ọ bụ nne mmadụ niile dị ndụ. 21Emesịa, Onyenwe anyị Chineke weere akpụkpọ anụ meere Adam na nwunye ya uwe oyiyi. 22Onyenwe anyị Chineke sịrị, “Lee, mmadụ adịla ka onye ọbụla nʼime anyị site nʼịmata ihe ọma na ihe ọjọọ. Ugbu a, ka ọ gharakwa ị setịpụ aka ya ghọrọ mkpụrụ osisi ahụ na-enye ndụ rie, si otu a dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.