Native Bible

Genesis 3:21 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Emesịa, Onyenwe anyị Chineke weere akpụkpọ anụ meere Adam na nwunye ya uwe oyiyi.

Genesis 3:21 in English

Genesis 3:21 · Berean Standard Bible

And the LORD God made garments of skin for Adam and his wife, and He clothed them.

Context

19Site nʼọsụsọ nke ga-agbapụta gị nʼihu ka ị ga-eri nri gị tutu ruo mgbe ị lọghachiri nʼala ebe ọ bụ site nʼala ka e si mepụta gị nʼihi na aja ka ị bụ, nʼaja ka ị ga-alaghachikwa.” 20Adam* gụrụ nwunye ya Iiv,* nʼihi na ọ bụ nne mmadụ niile dị ndụ. 21Emesịa, Onyenwe anyị Chineke weere akpụkpọ anụ meere Adam na nwunye ya uwe oyiyi. 22Onyenwe anyị Chineke sịrị, “Lee, mmadụ adịla ka onye ọbụla nʼime anyị site nʼịmata ihe ọma na ihe ọjọọ. Ugbu a, ka ọ gharakwa ị setịpụ aka ya ghọrọ mkpụrụ osisi ahụ na-enye ndụ rie, si otu a dịrị ndụ ruo mgbe ebighị ebi.” 23Nʼihi nke a, Onyenwe anyị Chineke chụpụrụ ya site nʼogige Iden ka ọ gaa na-arụ ọrụ nʼala e si wepụta ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.