Native Bible

Genesis 29:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ọzọ Jekọb jụrụ ha sị, “Ahụ ọ dịkwa ya mma?” Ha zara sị ya, “E, ahụ dị ya. Lee nwa ya nwanyị Rechel ka ọ chị atụrụ ya na-abịa.”

Genesis 29:6 in English

Genesis 29:6 · Berean Standard Bible

“Is he well?” Jacob inquired. “Yes,” they answered, “and here comes his daughter Rachel with his sheep.”

Context

4Jekọb jekwuru ndị na-elekọta atụrụ ahụ jụọ ha sị, “Ụmụnna m, ebee ka unu si?” Ha zara sị ya, “Anyị si Haran.” 5Ọ jụrụ ha sị, “Unu maara Leban, nwa Nahọ?” Ha zara sị, “Anyị ma ya.” 6Ọzọ Jekọb jụrụ ha sị, “Ahụ ọ dịkwa ya mma?” Ha zara sị ya, “E, ahụ dị ya. Lee nwa ya nwanyị Rechel ka ọ chị atụrụ ya na-abịa.” 7Jekọb kwuru sị, “Lee, anyanwụ ka na-acha. O rubeghị oge e ji achịbata igwe ụmụ anụ ụlọ. Nyenụ ha mmiri ka ha ṅụọ, ka ha laghachi gaa taa ahịhịa.” 8Ha zara sị ya, “Anyị agaghị enye ha mmiri tutu ruo mgbe igwe atụrụ niile bịakọtara, mgbe e wepụrụ nkume e ji mechie ọnụ olulu mmiri, mgbe ahụ ka anyị ga-enye ha mmiri.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.