Native Bible

Genesis 29:4 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Jekọb jekwuru ndị na-elekọta atụrụ ahụ jụọ ha sị, “Ụmụnna m, ebee ka unu si?” Ha zara sị ya, “Anyị si Haran.”

Genesis 29:4 in English

Genesis 29:4 · Berean Standard Bible

“My brothers,” Jacob asked the shepherds, “where are you from?” “We are from Haran,” they answered.

Context

2NʼEbe Nsọ a, ọ hụrụ otu olulu mmiri, hụkwa ụzọ igwe atụrụ atọ ndị nọ nʼakụkụ olulu mmiri nʼihi na ndị na-elekọta ha na-enye ha mmiri site nʼolulu mmiri ahụ. Nkume e ji mechie ọnụ olulu mmiri ahụ buru ibu. 3Nʼihi na mgbe igwe atụrụ niile bịazukọtara nʼolulu mmiri ahụ, ndị ọzụzụ atụrụ na-emeghepụ nkume ahụ nye ha mmiri. Emesịa, ha na-ejikwa nkume ahụ mechie ọnụ olulu mmiri ahụ. 4Jekọb jekwuru ndị na-elekọta atụrụ ahụ jụọ ha sị, “Ụmụnna m, ebee ka unu si?” Ha zara sị ya, “Anyị si Haran.” 5Ọ jụrụ ha sị, “Unu maara Leban, nwa Nahọ?” Ha zara sị, “Anyị ma ya.” 6Ọzọ Jekọb jụrụ ha sị, “Ahụ ọ dịkwa ya mma?” Ha zara sị ya, “E, ahụ dị ya. Lee nwa ya nwanyị Rechel ka ọ chị atụrụ ya na-abịa.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.