Jenesis 29:7
Genesis 29:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Jekọb kwuru sị, “Lee, anyanwụ ka na-acha. O rubeghị oge e ji achịbata igwe ụmụ anụ ụlọ. Nyenụ ha mmiri ka ha ṅụọ, ka ha laghachi gaa taa ahịhịa.”
Genesis 29:7 in English
Genesis 29:7 · Berean Standard Bible
“Look,” said Jacob, “it is still broad daylight; it is not yet time to gather the livestock. Water the sheep and take them back to pasture.”
Context
5Ọ jụrụ ha sị, “Unu maara Leban, nwa Nahọ?”
Ha zara sị, “Anyị ma ya.” 6Ọzọ Jekọb jụrụ ha sị, “Ahụ ọ dịkwa ya mma?”
Ha zara sị ya, “E, ahụ dị ya. Lee nwa ya nwanyị Rechel ka ọ chị atụrụ ya na-abịa.” 7Jekọb kwuru sị, “Lee, anyanwụ ka na-acha. O rubeghị oge e ji achịbata igwe ụmụ anụ ụlọ. Nyenụ ha mmiri ka ha ṅụọ, ka ha laghachi gaa taa ahịhịa.” 8Ha zara sị ya, “Anyị agaghị enye ha mmiri tutu ruo mgbe igwe atụrụ niile bịakọtara, mgbe e wepụrụ nkume e ji mechie ọnụ olulu mmiri, mgbe ahụ ka anyị ga-enye ha mmiri.” 9Mgbe Jekọb na ndị ọzụzụ atụrụ ndị a kpụ okwu nʼọnụ, Rechel chịịrị atụrụ nna ya bịakwute ha, nʼihi na onye ọzụzụ atụrụ nwanyị ka ọ bụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.