Jenesis 27:39
Genesis 27:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nna ya Aịzik zara sị ya, “Ebe obibi* gị ga-adịpụ adịpụ, site nʼebe akụnụba nke ala dị, site nʼebe igirigi nke eluigwe dị.
Genesis 27:39 in English
Genesis 27:39 · Berean Standard Bible
His father Isaac answered him: “Behold, your dwelling place shall be away from the richness of the land, away from the dew of heaven above.
Context
37Aịzik zara sị ya, “Emeela m ya ka ọ bụrụ onyeisi nʼebe ị nọ, mee ụmụnna ya niile ndị na-ejere ya ozi. Enyela m ya mkpụrụ ubi niile na mmanya ọhụrụ. Gịnị ọzọ ka m nwere ike imere gị, nwa m nwoke?” 38Ịsọ jụrụ nna ya sị, “Nna m, ọ bụ naanị otu ngọzị ka i nwere? Gọziekwa m nna m!” Ịsọ kwara akwa nʼoke olu. 39Nna ya Aịzik zara sị ya,
“Ebe obibi* gị ga-adịpụ adịpụ,
site nʼebe akụnụba nke ala dị,
site nʼebe igirigi nke eluigwe dị. 40Nriju afọ gị ga-abụ site na mma agha,
ị ga-ejekwara nwanne gị ozi.
Ma mgbe i mesịrị nwere onwe gị,
ị ga-atọpụ agbụ ya,
site nʼolu gị.” 41Ịsọ buru iro nʼobi megide Jekọb nʼihi ngọzị ahụ nna ya nyere ya. O kwuru nʼime onwe ya sị, “Oge a ga-eru ụjụ nʼihi nna m na-abịa nso, nʼoge ahụ aga m egbu nwanne m Jekọb.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.