Jenesis 27:37
Genesis 27:37 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Aịzik zara sị ya, “Emeela m ya ka ọ bụrụ onyeisi nʼebe ị nọ, mee ụmụnna ya niile ndị na-ejere ya ozi. Enyela m ya mkpụrụ ubi niile na mmanya ọhụrụ. Gịnị ọzọ ka m nwere ike imere gị, nwa m nwoke?”
Genesis 27:37 in English
Genesis 27:37 · Berean Standard Bible
But Isaac answered Esau: “Look, I have made him your master and given him all his relatives as servants; I have sustained him with grain and new wine. What is left that I can do for you, my son?”
Context
35Ma ọ zara sị ya, “Nwanne gị ejirila ụzọ aghụghọ bịa nara ngọzị gị.” 36Ịsọ kwuru sị, “E meziri kpọọ ya Jekọb,* onye aghụghọ. Lee, ọ ghọgbuola m ugboro abụọ. Nke mbụ, ọ naara m ọnọdụ ịbụ ọkpara m, ugbu a ọ narakwala m ngọzị m.” Ọ jụrụ ajụjụ sị, “Ọ bụ na i nweghị ngọzị ọ bụla fọdụrụ nke ị ga-agọzi m?” 37Aịzik zara sị ya, “Emeela m ya ka ọ bụrụ onyeisi nʼebe ị nọ, mee ụmụnna ya niile ndị na-ejere ya ozi. Enyela m ya mkpụrụ ubi niile na mmanya ọhụrụ. Gịnị ọzọ ka m nwere ike imere gị, nwa m nwoke?” 38Ịsọ jụrụ nna ya sị, “Nna m, ọ bụ naanị otu ngọzị ka i nwere? Gọziekwa m nna m!” Ịsọ kwara akwa nʼoke olu. 39Nna ya Aịzik zara sị ya,
“Ebe obibi* gị ga-adịpụ adịpụ,
site nʼebe akụnụba nke ala dị,
site nʼebe igirigi nke eluigwe dị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.