Jenesis 27:40
Genesis 27:40 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nriju afọ gị ga-abụ site na mma agha, ị ga-ejekwara nwanne gị ozi. Ma mgbe i mesịrị nwere onwe gị, ị ga-atọpụ agbụ ya, site nʼolu gị.”
Genesis 27:40 in English
Genesis 27:40 · Berean Standard Bible
You shall live by the sword and serve your brother. But when you rebel, you will tear his yoke from your neck.”
Context
38Ịsọ jụrụ nna ya sị, “Nna m, ọ bụ naanị otu ngọzị ka i nwere? Gọziekwa m nna m!” Ịsọ kwara akwa nʼoke olu. 39Nna ya Aịzik zara sị ya,
“Ebe obibi* gị ga-adịpụ adịpụ,
site nʼebe akụnụba nke ala dị,
site nʼebe igirigi nke eluigwe dị. 40Nriju afọ gị ga-abụ site na mma agha,
ị ga-ejekwara nwanne gị ozi.
Ma mgbe i mesịrị nwere onwe gị,
ị ga-atọpụ agbụ ya,
site nʼolu gị.” 41Ịsọ buru iro nʼobi megide Jekọb nʼihi ngọzị ahụ nna ya nyere ya. O kwuru nʼime onwe ya sị, “Oge a ga-eru ụjụ nʼihi nna m na-abịa nso, nʼoge ahụ aga m egbu nwanne m Jekọb.” 42Mgbe a gwara Ribeka ihe nwa ya nwoke nke okenye bụ Ịsọ kwuru, o ziri kpọọ nwa ya nwoke nke nta bụ Jekọb sị ya, “Lee, Ịsọ nwanne gị na-akasị onwe ya obi site nʼechiche ọ na-eche igbu gị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.