Jenesis 27:15
Genesis 27:15 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Emesịa, Ribeka chịpụtara uwe Ịsọ ọkpara ya, ndị dị mma, ndị ọ debere nʼụlọ ya, nye ya nwa ya nta bụ Jekọb.
Genesis 27:15 in English
Genesis 27:15 · Berean Standard Bible
And Rebekah took the finest clothes in the house that belonged to her older son Esau, and she put them on her younger son Jacob.
Context
13Nne ya gwara ya sị, “Nwa m nwoke ka ọbụbụ ọnụ gị dakwasị m. Naanị mee ihe m kwuru. Gaa wetara m ha.” 14Ya mere, ọ gara weta ha nye nne ya. O ji ha sie nri dị ụtọ, ụdị nke na-amasị nna ya. 15Emesịa, Ribeka chịpụtara uwe Ịsọ ọkpara ya, ndị dị mma, ndị ọ debere nʼụlọ ya, nye ya nwa ya nta bụ Jekọb. 16O jikwa akpụkpọ anụ ụmụ ewu nwere ajị ajị kee Jekọb nʼaka na nʼakụkụ olu ya na-akwọ mụrụmụrụ.* 17O bunyere nwa ya nwoke Jekọb nri ahụ na-atọ ụtọ, na achịcha o mere.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.