Native Bible

Genesis 27:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O jikwa akpụkpọ anụ ụmụ ewu nwere ajị ajị kee Jekọb nʼaka na nʼakụkụ olu ya na-akwọ mụrụmụrụ.*

Genesis 27:16 in English

Genesis 27:16 · Berean Standard Bible

She also put the skins of the young goats on his hands and on the smooth part of his neck.

Context

14Ya mere, ọ gara weta ha nye nne ya. O ji ha sie nri dị ụtọ, ụdị nke na-amasị nna ya. 15Emesịa, Ribeka chịpụtara uwe Ịsọ ọkpara ya, ndị dị mma, ndị ọ debere nʼụlọ ya, nye ya nwa ya nta bụ Jekọb. 16O jikwa akpụkpọ anụ ụmụ ewu nwere ajị ajị kee Jekọb nʼaka na nʼakụkụ olu ya na-akwọ mụrụmụrụ.* 17O bunyere nwa ya nwoke Jekọb nri ahụ na-atọ ụtọ, na achịcha o mere. 18O jekwuuru nna ya sị ya, “Nna m.” Ọ zara sị, “Ahaa, nwa m, onye ka ị bụ?”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.