Jenesis 27:13
Genesis 27:13 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nne ya gwara ya sị, “Nwa m nwoke ka ọbụbụ ọnụ gị dakwasị m. Naanị mee ihe m kwuru. Gaa wetara m ha.”
Genesis 27:13 in English
Genesis 27:13 · Berean Standard Bible
His mother replied, “Your curse be on me, my son. Just obey my voice and go get them for me.”
Context
11Ma Jekọb gwara Ribeka nne ya okwu sị ya, “Nwanne m nwoke Ịsọ bụ onye gbara ajị. Ahụ nke m na-akwọ mụrụmụrụ. 12Gịnị ga-eme ma nna m metụ m aka nʼahụ? Nʼihi ya, aga m abụ onye na-aghọ ya aghụghọ, aga m esi otu a wetara onwe m ịbụ ọnụ kama ngọzị.” 13Nne ya gwara ya sị, “Nwa m nwoke ka ọbụbụ ọnụ gị dakwasị m. Naanị mee ihe m kwuru. Gaa wetara m ha.” 14Ya mere, ọ gara weta ha nye nne ya. O ji ha sie nri dị ụtọ, ụdị nke na-amasị nna ya. 15Emesịa, Ribeka chịpụtara uwe Ịsọ ọkpara ya, ndị dị mma, ndị ọ debere nʼụlọ ya, nye ya nwa ya nta bụ Jekọb.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.