Jenesis 27:12
Genesis 27:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Gịnị ga-eme ma nna m metụ m aka nʼahụ? Nʼihi ya, aga m abụ onye na-aghọ ya aghụghọ, aga m esi otu a wetara onwe m ịbụ ọnụ kama ngọzị.”
Genesis 27:12 in English
Genesis 27:12 · Berean Standard Bible
What if my father touches me? Then I would be revealed to him as a deceiver, and I would bring upon myself a curse rather than a blessing.”
Context
10Ị ga-eburu ya bujere nna gị ka o rie, ka ya onwe ya gọzie gị tupu ọ nwụọ.” 11Ma Jekọb gwara Ribeka nne ya okwu sị ya, “Nwanne m nwoke Ịsọ bụ onye gbara ajị. Ahụ nke m na-akwọ mụrụmụrụ. 12Gịnị ga-eme ma nna m metụ m aka nʼahụ? Nʼihi ya, aga m abụ onye na-aghọ ya aghụghọ, aga m esi otu a wetara onwe m ịbụ ọnụ kama ngọzị.” 13Nne ya gwara ya sị, “Nwa m nwoke ka ọbụbụ ọnụ gị dakwasị m. Naanị mee ihe m kwuru. Gaa wetara m ha.” 14Ya mere, ọ gara weta ha nye nne ya. O ji ha sie nri dị ụtọ, ụdị nke na-amasị nna ya.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.