Jenesis 26:33
Genesis 26:33 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ọ kpọrọ ya Shiba. Ọ bụkwa nke a mere e ji akpọ obodo ahụ Bịasheba* ruo taa.
Genesis 26:33 in English
Genesis 26:33 · Berean Standard Bible
So he called it Shibah,* and to this day the name of the city is Beersheba.*
Context
31Nʼisi ụtụtụ echi ya, ndị ikom ahụ niile ṅụrịtaara onwe ha iyi ịgba ndụ. Aịzik zilagara ha, ha hapụrụ ya laa nʼudo. 32Nʼotu ụbọchị ahụ kwa, ndị ohu Aịzik bịakwutere ya gwa ya banyere olulu mmiri ha na-egwu, sị ya, “Anyị achọtala mmiri nʼolulu ahụ anyị na-egwu.” 33Ọ kpọrọ ya Shiba. Ọ bụkwa nke a mere e ji akpọ obodo ahụ Bịasheba* ruo taa. 34Mgbe Ịsọ gbara iri afọ anọ, ọ lụrụ Judit nwa Beiri, onye Het. Ọ lụkwara Basemat nwa Elọn, onye Het. 35Ha ghọrọ Aịzik na Ribeka ihe ọnọdụ obi ilu.
26:1 Abimelek, bụ aha ndịisi na-achị obodo a na-aza. Abimelek nke anyị nụrụ ihe banyere ya nʼakwụkwọ Jenesis isi 20, a nwụọlarị. Ọ nwụrụ ihe dịka iri afọ asatọ gara aga. Onye nke a bụ eze ọzọ.
26:33 Nke a pụtara Olulu mmiri ịṅụ iyi
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.