Jenesis 26:31
Genesis 26:31 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nʼisi ụtụtụ echi ya, ndị ikom ahụ niile ṅụrịtaara onwe ha iyi ịgba ndụ. Aịzik zilagara ha, ha hapụrụ ya laa nʼudo.
Genesis 26:31 in English
Genesis 26:31 · Berean Standard Bible
And they got up early the next morning and swore an oath to each other. Then Isaac sent them on their way, and they left him in peace.
Context
29na ị gaghị eme anyị ihe ọjọọ dịka anyị na-esighị mee gị ihe ọjọọ. I lezie anya nke ọma, ị ga-ahụ na anyị meere gị ihe ọma mgbe anyị hapụrụ gị ka ị laa nʼudo. Ugbu a, anyị maara na ị bụ onye Onyenwe anyị gọziri agọzi.” 30Aịzik meere ha mmemme nri dị ukwuu; ha riri, ṅụọkwa. 31Nʼisi ụtụtụ echi ya, ndị ikom ahụ niile ṅụrịtaara onwe ha iyi ịgba ndụ. Aịzik zilagara ha, ha hapụrụ ya laa nʼudo. 32Nʼotu ụbọchị ahụ kwa, ndị ohu Aịzik bịakwutere ya gwa ya banyere olulu mmiri ha na-egwu, sị ya, “Anyị achọtala mmiri nʼolulu ahụ anyị na-egwu.” 33Ọ kpọrọ ya Shiba. Ọ bụkwa nke a mere e ji akpọ obodo ahụ Bịasheba* ruo taa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.