Jenesis 26:29
Genesis 26:29 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
na ị gaghị eme anyị ihe ọjọọ dịka anyị na-esighị mee gị ihe ọjọọ. I lezie anya nke ọma, ị ga-ahụ na anyị meere gị ihe ọma mgbe anyị hapụrụ gị ka ị laa nʼudo. Ugbu a, anyị maara na ị bụ onye Onyenwe anyị gọziri agọzi.”
Genesis 26:29 in English
Genesis 26:29 · Berean Standard Bible
that you will not harm us, just as we have not harmed you but have done only good to you, sending you on your way in peace. And now you are blessed by the LORD.”
Context
27Aịzik jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji bịakwute m, ebe ọ bụ na unu kpọrọ m asị, chụpụkwa m site nʼetiti unu?” 28Ha sị, “Anyị hụrụ nke ọma na Onyenwe anyị nọnyeere gị, ya mere anyị ji sị, ‘O kwesiri ka ịṅụ iyi dị nʼetiti anyị na gị,’ ka anyị na gị gbaakwa ndụ 29na ị gaghị eme anyị ihe ọjọọ dịka anyị na-esighị mee gị ihe ọjọọ. I lezie anya nke ọma, ị ga-ahụ na anyị meere gị ihe ọma mgbe anyị hapụrụ gị ka ị laa nʼudo. Ugbu a, anyị maara na ị bụ onye Onyenwe anyị gọziri agọzi.” 30Aịzik meere ha mmemme nri dị ukwuu; ha riri, ṅụọkwa. 31Nʼisi ụtụtụ echi ya, ndị ikom ahụ niile ṅụrịtaara onwe ha iyi ịgba ndụ. Aịzik zilagara ha, ha hapụrụ ya laa nʼudo.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.