Native Bible

Genesis 26:27 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Aịzik jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji bịakwute m, ebe ọ bụ na unu kpọrọ m asị, chụpụkwa m site nʼetiti unu?”

Genesis 26:27 in English

Genesis 26:27 · Berean Standard Bible

“Why have you come to me?” Isaac asked them. “You hated me and sent me away.”

Context

25Ya mere, o wuru ebe ịchụ aja nʼebe ahụ kpọkuo aha Onyenwe anyị. Ọ makwara ụlọ ikwu ya nʼebe ahụ. Ndị na-ejere ya ozi gwukwara olulu mmiri. 26Abimelek na Ahuzat, onye ndụmọdụ ya, na Fikọl onyeisi ndị agha ya sitere Gera jekwuru Aịzik. 27Aịzik jụrụ ha sị, “Gịnị mere unu ji bịakwute m, ebe ọ bụ na unu kpọrọ m asị, chụpụkwa m site nʼetiti unu?” 28Ha sị, “Anyị hụrụ nke ọma na Onyenwe anyị nọnyeere gị, ya mere anyị ji sị, ‘O kwesiri ka ịṅụ iyi dị nʼetiti anyị na gị,’ ka anyị na gị gbaakwa ndụ 29na ị gaghị eme anyị ihe ọjọọ dịka anyị na-esighị mee gị ihe ọjọọ. I lezie anya nke ọma, ị ga-ahụ na anyị meere gị ihe ọma mgbe anyị hapụrụ gị ka ị laa nʼudo. Ugbu a, anyị maara na ị bụ onye Onyenwe anyị gọziri agọzi.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.