Native Bible

Genesis 21:8 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Nwata ahụ tokwara, ruo mgbe a kwụsịrị ya ara.* Nʼụbọchị ahụ a kwụsịrị ya ara, Ebraham kpọrọ oriri.

Genesis 21:8 in English

Genesis 21:8 · Berean Standard Bible

So the child grew and was weaned, and Abraham held a great feast on the day Isaac was weaned.

Context

6Nʼoge ahụ, Sera kwuru sị, “Chineke ewetarala m ọchị. Ndị niile nụrụ akụkọ a ga-esoro m chịa ọchị.” 7O kwukwara sị, “Onye gaara agwa Ebraham sị ya na Sera ga-azụlite ụmụntakịrị. Ma otu ọ dị, amụtarala m ya nwa nwoke ugbu a o merela agadi.” 8Nwata ahụ tokwara, ruo mgbe a kwụsịrị ya ara.* Nʼụbọchị ahụ a kwụsịrị ya ara, Ebraham kpọrọ oriri. 9Ma mgbe Sera hụrụ na nwa nwoke ahụ Hega onye Ijipt mụtaara Ebraham nọ na-akwa emo, 10ọ gwara Ebraham okwu sị ya, “Chụpụ ohu nwanyị a na nwa ya. Nʼihi na nwa nwoke ohu nwanyị agaghị eso nwa m nwoke Aịzik keta oke nʼihe nketa.”

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.