Jenesis 21:5
Genesis 21:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ebraham agbaala narị afọ mgbe a mụrụ Aịzik nwa ya nwoke.
Genesis 21:5 in English
Genesis 21:5 · Berean Standard Bible
Abraham was a hundred years old when his son Isaac was born to him.
Context
3Ebraham gụrụ nwantakịrị ahụ Sera mụụrụ ya aha, kpọọ ya Aịzik. 4Mgbe Aịzik nọrọ ụbọchị asatọ site nʼụbọchị a mụrụ ya, Ebraham biri ya ugwu dịka Chineke si nye ya nʼiwu. 5Ebraham agbaala narị afọ mgbe a mụrụ Aịzik nwa ya nwoke. 6Nʼoge ahụ, Sera kwuru sị, “Chineke ewetarala m ọchị. Ndị niile nụrụ akụkọ a ga-esoro m chịa ọchị.” 7O kwukwara sị, “Onye gaara agwa Ebraham sị ya na Sera ga-azụlite ụmụntakịrị. Ma otu ọ dị, amụtarala m ya nwa nwoke ugbu a o merela agadi.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.