Native Bible

Genesis 21:3 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ebraham gụrụ nwantakịrị ahụ Sera mụụrụ ya aha, kpọọ ya Aịzik.

Genesis 21:3 in English

Genesis 21:3 · Berean Standard Bible

And Abraham gave the name Isaac * to the son Sarah bore to him.

Context

1Onyenwe anyị jiri amara leta Sera dịka o kwuru na ọ ga-eme. Onyenwe anyị meere Sera ihe o kwere na nkwa. 2Sera tụụrụ ime, mụọra Ebraham nwa nwoke nʼoge o merela agadi. Ọ mụrụ ya nʼoge ahụ a kara aka Chineke kwere ya na nkwa. 3Ebraham gụrụ nwantakịrị ahụ Sera mụụrụ ya aha, kpọọ ya Aịzik. 4Mgbe Aịzik nọrọ ụbọchị asatọ site nʼụbọchị a mụrụ ya, Ebraham biri ya ugwu dịka Chineke si nye ya nʼiwu. 5Ebraham agbaala narị afọ mgbe a mụrụ Aịzik nwa ya nwoke.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.